Man United vs Chelsea: Egwu a nyụru ka ọkụ mana Chelsea alaferela

Belgian na Hazard

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Nkọwa foto, Belgian na Hazard

Manchester United na Chelsea akwakọrịtala mpị taa n'Old Trafford bụ ebe ha ji otu ọkpụ, otu ọkpụ gbaa akaahịa n'ọkara nke mbụ.

Juan Mata nke Manchester United bu ụzọ tinye goolu nke mbụ na mpio ndị Chelsea na nkeji iri na otu ebe Chelsea gbaara isi onwe ha na nkeji iri anọ na atọ site n'aka Marcus Alonso.

Ya bụ egwu bọọlụ kpụ ọkụ n'ọnụ nke bụ na mpe mpe akwụkwọ edo edo ruru ise e nyere ndị rụsara ibe ha arụrụala na ya bụ egwuruegwu.

Manchester United ji atọ ebe Chelsea ji abụọ.

Okwu a kpụ n'ọnụ na ya bụ egwuruegwu bụ mmeghie aka David de Gea bụ ochee goolu ndị Man Utd bụ nke mere e ji nye ha goolu ahụ.

De Gea

Ebe foto si, Getty Images

Nke a mere ka ebumnobi ndị Manchester United ịgba Champions League ọzọ dịzị ka ọkụ chọrọ ịnyụ anyụ.

Bụ nke nyere Chelsea ohere ịnọsi ike n'ogogo nke anọ ebe Man Utd gbara ọnyụpa na ndị nke isii (6).

Egwuruegwu a bere n'otu ọkpụ, otu ọkpụ ka e gbuchiri.

Akụkọ ga-amasị gị: