Manchester United vs Newcastle: C Ronaldo egosila na ọ ka bụ odogwu n'egwu ọ ma agba

Romelu Lukaku na Cristiano Ronaldo

Ebe foto si, Getty Images

Afọ bọọlụ nke 2021/2022 ga-abụkwa ọkpọka dịka mmadụ abụọ a bụ Cristiano Ronaldo na Romelu Lukaku gosiri ihe ha nwere ike imwenwu.

Ronaldo nyere goolu abụọ dịka Manchester United ji ọkpụ goolu anọ a satara otu merie Newcastle.

Mana Lukaku nyekwara goolu abụọ nke ya oge Chlsea gbara ndị Aston Villa 3-0.

Cristiano Ronaldo

Cristiano Ronaldo

Ebe foto si, Getty Images

Ronaldo bụ aha a kpụ n'ọnụ n'ụwa niile kamgbe o si Juventus laghachi Manchester United.

Ọtụtụ ndị ma anya egwuregwu bọọlụ ekwuola na o nwere ike inyere Man Utd aka bute iko EPL nke afọ 2022.

Mana n'asọmpi ndị Man Utd na ndị Newcastle n'ehihie Satọdee aka Roinaldo gosiri na onye a na-ekwu nwere ihe ọ na-eme.

Man Utd ji ọkpụ goolu anọ a satara otu merie Newcastle, ebe C Ronaldo nyere abụọ n'ime ha.

Matakwa na nke a bụ asọmpi izizi ọ na-agbara Man Utd kamgbe ọ lọghachiri azụ.

Bruno Fernandez na Jesse Lingard nyeziri abụọ ndị ọzọ.

Romelu Lukaku

Lukaku

Ebe foto si, Getty Images

Chelsea wepụtara ego gbara ọkpụrụkpụ (£97.5 million) iji si n'otu Inter Milan zụta Lukaku n'afọ a.

Cheta na Lukaku nyeere ndị Inter Milanaka mabute iko bọọlụ nke mba Itali nke afọ 2020/2021.

Nke a bụ asọmpi mbụ Lukaku na-agbara Chelsea n'ama egwuregwu Stamford Bridge kamgbe a zụtara ya ọzọ.

O nyebuola goolu abụọ tupu taa.

Myiri dị n'etiti Ronaldo na Lukaku

Dịka ndị ọgba bọọlụ, Ronaldo na Lukaku yiri onwe ha n'ụzọ dị icheiche:

  • Ronaldo agbabuorola Man United. Lukaku agbabuorola ndị Chelse
  • Ọ bụ mba Italy ka e si zụta ha abụọ: Lukaku - Inter Milan, Ronaldo - Juventus
  • Ha abụọ jicha goolu emere ndị mmadụ ọjị
  • Ronaldo bụ onye kacha nye goolu na Italy n'afọ bọọlụ gara aga. Lukaku bụ osote ya
  • Ha abụọ nyere goolu abụọ taa
  • Ha abụọ bụ ndị kara nye goolu na mba ha dị icheiche. Ronaldo - Portugal; Lukaku - Belgium
  • Ha abụọ na-agbacha ụkwụ abụọ; ma ụkwụ aka nri ma ụkwụ aka ekpe
  • Na abụọ macha eji isi enye goolu

Mana otu ndịiche doro anya bụ na Ronaldo ka Lukaku bụrụ okenye.

Ronaldo dị afọ iri atọ na isii (36), ebe Lukaku dị afọ iri abụọ na asatọ (28).

Ọtụtụ na-ekwu na ike agwụwala Ronaldo, mana ihe ọ gbara taa egosila na agadi anaghị aka nka n'egwu ọ ma agba.